Job 39

1“Ị maara mgbe ewu ọhịa bi nʼelu ugwu ji amụ nwa?
O nweela mgbe ị ji hụ nne ele ka ọ na-amụpụta nwa ya?
2Ị na-agụkọ ọnwa ole afọ ime ha na-adị tupu ha amụọ nwa ha.
Ị maara oge ha na-amụ ụmụ ha?
3Ha na-amakpuru ala mụpụta nwa ha.
Ihe mgbu nke ọmụmụ nwa ha ebiekwa.
4Ụmụ ha na-eto nʼọhịa gbasiekwa ike.
Ha na-apụ, ha adịghị alaghachikwute ha ọzọ.

5“Onye na-eme ka ịnyịnya ibu ọhịa nwere onwe ya?
Onye na-atọpụ agbụ e kere ya?
6Nke m nyere ala ihe na-adịghị ka ọ bụrụ ebe obibi ha,
ala nnu ahụ ka ọ bụrụ ụlọ ha.
7Ụzụ dị nʼobodo adịghị emetụta ya,
ọ naghị anụkwa mbigbọ nke onye na-achị ya.
8Elu ugwu niile bụ ebe ịkpa nri ya,
ebe ahụ ka ọ na-achọpụta ahịhịa ndụ ọbụla.

9“Ị nwere ike ime ka atụ jeere gị ozi?
Ị nwere ike ime ka ọ nọdụ nʼabalị nʼụlọ ebe ị na-azụ anụ ụlọ gị nri?
10Ị nwere ike ime ka atụ rụọra gị ọrụ nʼubi gị?
Ọ ga-akpụgharịrị gị ọgụ ị ji akọ ala?
11Ị ga-atụkwasị ya obi nʼihi na ike ya hiri nne?
Ị ga-ahapụrụ ya ọrụ ndị ahụ siri ike ka ọ rụọ?
12I nwere ike ịtụkwasị ya obi ka o gaa bulatara gị ọka
site nʼebe ịzọcha ọka gị?

13“Enyi nnụnụ na-eji ọṅụ gbasapụ nku ya,
ma a pụghị iji nku ya tụnyere
nku na abụba nke ụgbala.
14Ọ na-eyi akwa ya nʼala
ma hapụ ha ka uzuzu kpoo ha ọkụ.
15Ọ naghị emetụ ya nʼobi na ụkwụ nwere ike ịzọpịa ha
maọbụ na anụ ọhịa nwere ike zọrie ha.
16Ọ na-emeso ụmụ ya ihe ike dịka a ga-asị na ha abụghị nke ya,
ọ dịghị emetụta ya na ndọgbu nʼọrụ ya nwere ike i bụ nʼefu, ma ọ dịghị atụ egwu.
17Nʼihi na Chineke ekenyeghị ya amamihe
maọbụ kenye ya oke na inwe uche.
18Ma ọ na-agbalite ọsọ. Mgbe ọbụla ọ gbasara nku ya ịgba ọsọ,
ọ na-achị ịnyịnya na onye na-agba ịnyịnya ọchị.

19“Ọ bụ gị na-enye ịnyịnya ike ya,
ka ọ bụ gị mere ka ajị ogologo ahụ o nwere dịrị nʼolu ya?
20Ị na-eme ya ka ọ wụgharịa dịka igurube,
were ebube
Maọbụ, nganga
nke ịmapụ imi ya na-eyinye ihe oke egwu?
21Ọ na-azọ ụkwụ gam gam nʼala, ọ na-aṅụrị ọṅụ nʼihi ike ya,
ọ na-apụ izute agha na-atụghị egwu.
22Ọ na-achị ihe egwu ọchị, ụjọ ọbụla anaghị atụ ya;
ọ naghị esi na mma agha wezuga onwe ya.
23Akpa àkụ na-ayọgharị nʼakụkụ ya,
ya na ùbe na arụa na-egbu maramara.
24Mgbe ụzụ agha bara ya nʼisi, ọ na-eripịa ala.
Mgbe ọ nụrụ ụda opi ike, ọ naghị eguzo otu ebe.
25Mgbe ụzụ agha bara ya nʼisi, ọ na-eti mkpu sị, ‘Ahaa!’
Site nʼebe dị anya ka ọ na-anụ isisi agha.
Ọ na-aṅụrịkwa ọṅụ maka iti mkpu nke ndị ọchịagha nʼoge agha.

26“Ọ bụ site nʼamamihe gị ka egbe ji efego nʼelu,
gbasaakwa nku ya gaa nʼebe ndịda?
27Ọ bụ gị nyere ugo iwu ifeli elu
ma wuo akwụ ya nʼebe dị elu?
28Nʼelu nkume dị elu ka ọ na-ebi nọọkwa ọnọdụ abalị;
ọwara nkume dị elu bụ ebe e wusiri ike ya.
29O bụ site nʼebe ahụ
ka ọ na-esi enyochapụta ihe ọ ga-eburu.
30Ụmụ ya na-amịchakwa ọbara,
nʼihi na ebe ọ na-aga bụ ebe ọbụla ọ ga-ahụ ihe e gburu egbu.”
Copyright information for IboBIU